Job 28

Nwa mgbe nta: Ebe a na-achọta amamihe

1Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;
ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
2E si nʼime ala ewepụta igwe,
ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
3Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;
ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,
na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
4Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,
nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,
nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
Nʼoge ochie, ọ bụ nʼoche e ji eriri kegide ka ndị na-egwupụta ihe dị iche iche site nʼime ala na-anọdụ ala. Mgbe a na-adọtu ha, ụkwụ ha adịghị eru ala, ha na-akwụfegharịkwa nʼihi ọnọdụ ha.

5Ala ahụ e si na ya enweta nri,
abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
6Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;
aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
7Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;
anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
8Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,
ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
9Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ
mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
10Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,
anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
11Ha na-achọpụta isi mmiri niile
ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.

12Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?
Olee kwa ebe nghọta bi?
13Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,
agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,”
osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
15A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,
apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
16A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,
a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
17A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,
maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
18Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;
ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
19A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;
a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.

20Olee ebe amamihe si abịa?
Olee ebe nghọta bi?
21E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,
e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
22Mbibi na ọnwụ na-asị;
“Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
23Chineke ghọtara ụzọ ya,
naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
24Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa,
na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
25Mgbe o hiwere ike nke ikuku,
tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
26mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu
meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
27mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya,
meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
28Ọ sịrị mmadụ,
“Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;
ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
Copyright information for IboBIU